6“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
7Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
8Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.
9Ma ugbu a, ana m aṅụrị ọṅụ banyere ndị na-achị ụmụ Izrel. Ndị ji obi ha niile were onwe ha nye nʼetiti ndị Izrel. Toonu Onyenwe anyị!
10“Kwupụtanụ ya, unu ndị na-agba ịnyịnya ibu dị ọcha, unu ndị na-anọkwasị nʼelu akwa dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya unu, na unu ndị na-eji ukwu na-agagharị nʼokporoụzọ. Tụleenụ