4“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.
5E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.
6“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.
7Ọ dịkwaghị ihe gara aga nʼobodo Izrel, tutu ruo mgbe m bịara, ee, mgbe m bụ Debọra bịara dịka nne nye Izrel.
8Mgbe ụmụ Izrel họrọ ife chi ndị ọzọ ofufe, mgbe agha bịara nʼọnụ ụzọ ama niile, ahụghị ọ bụladị otu ụta maọbụ ùbe. E, ọ bụladị nʼetiti iri puku ndị agha anọ, a hụghị otu ngwa agha ọbụla.