Ndị Ikpe 5

“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.

Judges 5:4 (UKJV) LORD, when you went out of Seir, when you marched out of the field of Edom, the earth trembled, and the heavens dropped, the clouds also dropped water.

2“Mgbe ndị ndu na-edu nʼIzrel, mgbe ndị mmadụ jikwa afọ ofufu nye onwe ha, toonu Onyenwe anyị!

3“Nụrụnụ nke a, unu ndị eze, Geenụ ntị, unu ndịisi! Mụ onwe m, ọ bụladị mụ onwe m, ga-abụku Onyenwe anyị abụ. Aga m abụ abụ otuto nye Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel.

4“Onyenwe anyị, mgbe i si Sia pụta, mgbe i sitere nʼala Edọm gabiga, ụwa mara jijiji, mmiri ozuzo dị ukwuu sikwa na mbara eluigwe zodata.

5E, ọ bụladị ugwu ukwu niile mara jijiji nʼihu Onyenwe anyị. Ugwu Saịnaị makwara jijiji nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel.

6“Nʼụbọchị Shamga, nwa Anat, nʼụbọchị Jael, ndị ịnyịnya ibu na-azụ ahịa nʼọzara kwusịrị, ndị ije niile na-esi nʼakụkụ ụzọ gbagọrọ agbagọ na-aga.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.