Ndị Ikpe 6

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.”

Judges 6:14 (UKJV) And the LORD looked upon him, and said, Go in this your might, and you shall save Israel from the hand of the Midianites: have not I sent you?

12Mmụọ ozi Onyenwe anyị pụtara ihe nʼebe ahụ gwa ya okwu sị, “Gị dike na dimkpa nʼagha, Onyenwe anyị nọnyeere gị.”

13Gidiọn zara sị, “Biko onyenwe m, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere anyị, gịnị mere ihe ndị a niile ji na-adakwasị anyị? Ebeekwanụ ka ihe ịrịbama ahụ niile dị nke nna anyị ha gwara anyị sị, ‘Ọ bụghị site nʼIjipt ka Onyenwe anyị siri gbapụta anyị?’ Ma ugbu a, Onyenwe anyị ajụla anyị, hapụ anyị nʼaka ndị Midia ka ha laa anyị nʼiyi.”

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.”

15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.”

16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.