14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere ya iwu sị ya, “Ngwa, jiri ike gị dị ukwuu pụọ, gaa ka ị gbapụta ụmụ Izrel site nʼaka ndị Midia. Mụ onwe m na-ezigakwa gị.”
15Ma Gidiọn sịrị ya, “Biko, Onyenwe m, olee otu m ga-esi zọpụta Izrel? Lee, esi m nʼikwu dịkarịsịrị nta nʼime Manase pụta. Mụ onwe m bụkwa onye dịkarịsịrị ala nʼezinaụlọ m.”
16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”
17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu.
18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.”