16Ma Onyenwe anyị zara sị ya, “Mụ onwe m ga-anọnyere gị. Ị ga-ebibikwa ndị Midia niile.”
17Gidiọn zaghachiri sị, “Ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nye m ihe ịrịbama nke ga-egosi na ọ bụ gị nʼezie na-agwa m okwu.
18Biko esikwala ebe a pụọ ruo mgbe m lọghachiri weta onyinye m ga-eche nʼihu gị.” Onyenwe anyị zara sị ya, “Aga m eche ruo mgbe ị lọghachiri.”
19Gidiọn mere ngwangwa laa nʼụlọ ya, gbuo otu nwa ewu, sie ya. O jikwa ụtụ ọka mee achịcha, nke ihe na-eko achịcha na-adịghị nʼime ya. Emesịa, o tinyere anụ ahụ nʼime nkata, wụnyekwa ofe nʼime ite, buru ha jekwuru Mmụọ ozi ahụ, ebe ọ nọ na-eche ya nʼokpuru osisi ook ahụ.
20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a.