Ndị Ikpe 6

Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!”

Judges 6:22 (UKJV) And when Gideon perceived that he was an angel of the LORD, Gideon said, Alas, O LORD God! for because I have seen an angel of the LORD face to face.

20Mmụọ ozi nke Chineke sịrị ya, “Were anụ a na ogbe achịcha ahụ na-ekoghị eko, tụkwasị ha nʼelu nkume a, wụpụkwa ofe ahụ.” Gidiọn mere otu a.

21Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ metụrụ ọnụ mkpanaka ahụ nke dị nʼaka ya nʼelu anụ na achịcha ahụ na-ekoghị eko. Ọkụ sitere nʼoke nkume ahụ nwuru, rechapụ anụ ahụ na achịcha nʼekoghị eko ahụ. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị ahụ gbara barịị site nʼihu ya.

22Mgbe Gidiọn ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị, o tiri mkpu akwa sị, “Ewoo! Onyenwe m Onyenwe anyị! Ahụla m Mmụọ ozi Onyenwe anyị ihu na ihu!”

23Ma Onyenwe anyị sịrị ya, “Udo dịrị gị, atụla egwu! Ị gaghị anwụ.”

24Ya mere, Gidiọn wuuru Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, kpọọ ya, Onyenwe anyị bụ Onye Udo. Ụlọ nchụaja ahụ dịkwa nʼime obodo Ofra nʼala ndị Abieza ruo taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.