Ndị Ikpe 6

Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ!

Judges 6:28 (UKJV) And when the men of the city arose early in the morning, behold, the altar of Baal was cast down, and the grove was cut down that was by it, and the second bullock was offered upon the altar that was built.

26Mgbe ahụ, wuoro Onyenwe anyị bụ Chineke gị ebe ịchụ aja, nʼelu ebe a dị oke elu. Jiri osisi Ashera ahụ nke ị gbuturu kwanye ọkụ, chụọ oke ehi nke abụọ ahụ dịka aja nsure ọkụ.”

27Ya mere, Gidiọn duuru mmadụ iri site na ndị na-ejere ya ozi, ndị nyeere ya aka imezu ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Kama, site nʼegwu maka ndị ikwu nna ya, na ndị bi nʼobodo ahụ, o mere ihe ndị a niile nʼime abalị.

28Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ!

29Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” Mgbe ha ji nwayọọ jụgharịa ajụjụ, a gwara ha sị, “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ya.”

30Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.