Ndị Ikpe 6

Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”

Judges 6:30 (UKJV) Then the men of the city said unto Joash, Bring out your son, that he may die: because he has cast down the altar of Baal, and because he has cut down the grove that was by it.

28Mgbe chi bọrọ, mgbe ndị obodo ahụ malitere ijegharị, ha hụrụ na a kwatuola ebe ịchụ aja Baal, hụkwa na e gbutuola ogidi osisi Ashera dị nʼakụkụ ya, ma werekwa oke ehi nke abụọ chụọ aja nʼelu ebe ịchụ aja ọhụrụ ahụ!

29Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” Mgbe ha ji nwayọọ jụgharịa ajụjụ, a gwara ha sị, “Ọ bụ Gidiọn nwa Joash mere ya.”

30Ndị obodo ahụ sịrị Joash, “Kpụpụta nwa gị. Ọ ga-anwụrịrị, nʼihi na ọ kwadala ebe ịchụ aja Baal, gbutuo ogidi osisi Ashera, nke dị nʼakụkụ ya.”

31Ma Joash tinyere ọnụ jụọ ha ajụjụ sị ha, “Baal, ọ gwara unu na ọ chọrọ ka unu nyere ya aka? Unu na-achọ ịzọpụta ya? Onye ọbụla wepụtara onwe ya maka ịlụrụ Baal ọgụ ga-anwụ tupu chi echi abọọ. Ọ bụrụ nʼezie na Baal bụ chi, hapụnụ ya ka o tigbuo onye ahụ mebiri ebe ịchụ aja ya.”

32Ya mere, nʼụbọchị ahụ, ha malitere ịkpọ Gidiọn “Jerub-Baal.” Ha kwuru sị, “Ka Baal lụọrọ onwe ya ọgụ,” nʼihi na ọ kwadara ebe ịchụ aja Baal.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.