Ndị Ikpe 8

O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.

Judges 8:16 (UKJV) And he took the elders of the city, and thorns of the wilderness and briers, and with them he taught the men of Succoth.

14Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.

15Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’ ”

16O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.

17Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.

18Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.