Ndị Ikpe 8

Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”

Judges 8:18 (UKJV) Then said he unto Zebah and Zalmunna, What manner of men were they whom all of you slew at Tabor? And they answered, As you are, so were they; each one resembled the children of a king.

16O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.

17Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.

18Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”

19Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.”

20O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.