29Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
30Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
31O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.
32Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza.
33Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.