27Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya.
28Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
29Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
30Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
31O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.