3Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”
4Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya.
5Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
6Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.