5Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
6Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
7Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.
8Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’
9“Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’