11Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”
12“Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, nke e mere ka ọ bịakwasị m, bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?
13“O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
14“Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.
15“Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.