15“Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.
16“Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.”
17Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.
18“Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.