19“Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.
20“Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
21“Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.
22“Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.”