Abụ Akwa 2

Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.

Lamentations 2:19 (UKJV) Arise, cry out in the night: in the beginning of the watches pour out yours heart like water before the face of the LORD: lift up your hands toward him for the life of your young children, that faint for hunger in the top of every street.

17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.

18Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.

19Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.

20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?

21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.