Abụ Akwa 2

“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.

Lamentations 2:21 (UKJV) The young and the old lie on the ground in the streets: my virgins and my young men are fallen by the sword; you have slain them in the day of yours anger; you have killed, and not pitied.

19Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.

20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?

21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.

22“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri, otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile. Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ; ndị m lekọtara, zụlitekwa ka ndị iro m lara nʼiyi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.