Abụ Akwa 2

Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.

Lamentations 2:7 (UKJV) The LORD has cast off his altar, he has abhorred his sanctuary, he has given up into the hand of the enemy the walls of her palaces; they have made a noise in the house of the LORD, as in the day of a solemn feast.

5Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.

6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.

7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.

8Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.

9Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.