Abụ Akwa 2

Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.

Lamentations 2:5 (UKJV) The LORD was as an enemy: he has swallowed up Israel, he has swallowed up all her palaces: he has destroyed his strong holds, and has increased in the daughter of Judah mourning and lamentation.

3O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.

4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, dịka onye iro. Dịka onye iro kwa o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, nʼelu ụlọ ada Zayọn.

5Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.

6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.

7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya gbakụta ebe nsọ ya azụ. O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya nyefee nʼaka onye iro; ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.