17Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
20Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.