1Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.
2Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.
4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.