13Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
14Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.