15Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
16Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
17Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
18Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
19Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.