Abụ Akwa 5

Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.

Lamentations 5:4 (UKJV) We have drunken our water for money; our wood is sold unto us.

2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.

3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.

4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.

5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.

6Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.