1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
4Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
5Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.