1Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
2E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
3Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.