Abụ Akwa 5

Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.

Lamentations 5:9 (UKJV) We got our bread with the peril of our lives because of the sword of the wilderness.

7Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.

8Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.

9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.

10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.

11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.