8Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
9Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
10Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
11Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
12Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.