1Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.
2Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.
3Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.