Levitikọs 10

Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.

Leviticus 10:2 (UKJV) And there went out fire from the LORD, and devoured them, and they died before the LORD.

1Ma ụmụ Erọn, Nadab na Abihu, were ọkụ tinye nʼihe ịgụ ọkụ ha, tinyekwa ụda na-esi isi nʼọkụ ahụ, si otu a chee ọkụ na-adịghị nsọ nʼihu Onyenwe anyị, nʼụzọ megidere ihe e nyere nʼiwu.

2Nʼihi ya, ọkụ sitere nʼihu Onyenwe anyị daa rechapụ ha, ha nwụrụ nʼihu Onyenwe anyị.

3Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị bu nʼobi mgbe o kwuru sị, “ ‘Nʼetiti ndị niile na-abịaru m nso ka a ga-edo m nsọ ọ bụkwa nʼihu ọha mmadụ, ka a ga-asọpụrụ m.’ ” Ma Erọn gbara nkịtị.

4Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Mishael na Elzafan, ụmụ Uziel, nwanne nna Erọn sị ha, “Bịanụ nso. Gaanụ buputa ozu ụmụnne unu site nʼihu ebe nsọ, buru ha gaa nʼazụ ebe obibi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.