Levitikọs 9

Ọkụ sitekwara nʼebe Onyenwe anyị nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.

Leviticus 9:24 (UKJV) And there came a fire out from before the LORD, and consumed upon the altar the burnt offering and the fat: which when all the people saw, they shouted, and fell on their faces.

22Erọn weliri aka ya elu nʼebe ụmụ Izrel nọ, gọzie ha. Emesịa, mgbe ọ chụchara aja mmehie, na aja nsure ọkụ na aja udo, o sitere nʼebe ịchụ aja ahụ rịdata.

23Mosis na Erọn bara nʼime ụlọ nzute. Mgbe ha pụtara, ha gọziri ọha mmadụ ahụ. Mgbe ahụ kwa, ebube Onyenwe anyị pụtara ìhè nye mmadụ niile nʼọgbakọ ahụ.

24Ọkụ sitekwara nʼebe Onyenwe anyị nọ daa, rechapụ aja nsure ọkụ ahụ, na abụba ahụ dị nʼebe ịchụ aja. Mgbe ndị Izrel hụrụ ya, ha tiri mkpu ọṅụ. Daa, kpuo ihu nʼala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.