Levitikọs 10

Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”

Leviticus 10:11 (UKJV) And that all of you may teach the children of Israel all the statutes which the LORD has spoken unto them by the hand of Moses.

9“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.

10Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.

11Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”

12Mosis sịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom fọdụrụ, bụ Elieza na Itama, “Werenụ onyinye mkpụrụ ọka nke fọdụrụ site na onyinye nsure ọkụ, nke a kwadoro na-etinyeghị ihe iko achịcha ọbụla, bụ nke e nyere Onyenwe anyị. Rienụ ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja, nʼihi na ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.

13Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.