Levitikọs 10

“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.

Leviticus 10:9 (UKJV) Do not drink wine nor strong drink, you, nor your sons with you, when all of you go into the tabernacle of the congregation, lest all of you die: it shall be a statute for ever throughout your generations:

7Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha.

8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị,

9“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.

10Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha.

11Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.