13Rienụ ya nʼime ebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke ruru unu na ụmụ unu ndị ikom site nʼonyinye nsure ọkụ e nyere Onyenwe anyị; nʼihi na nke a bụ ihe e nyere m nʼiwu.
14Ma unu na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom ka ọ dịkwara iri obi anụ na apata ya, nke e fufere nʼihu Onyenwe anyị. Kama, ọ bụ nʼebe dị ọcha ka unu ga-anọ rie ya. Nke a bụ oke enyere unu na ụmụ unu site nʼaja udo nke ụmụ Izrel.
15Apata ụkwụ anụ nke aja mbuli na obi anụ ahụ nke e fufere, ka a ga-eweta ya na abụba ya nye dịka onyinye sitere nʼọkụ. A ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe. Nke a ga-abụ oke ruuru unu na ụmụ unu mgbe niile, dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.”
16Mgbe Mosis jụrụ ajụjụ banyere mkpi ahụ e ji chụọ aja mmehie, ọ chọpụtara na a kpọọla ya ọkụ. O wesoro Elieza na Itama ụmụ ndị ikom Erọn iwe sị ha,
17“Gịnị mere unu erighị anụ ahụ e ji chụọ aja mmehie nʼakụkụ ebe nsọ ahụ? Ọ bụ nke dịkarịsịrị nsọ; e nyere unu ya maka iwepụ ọmụma ikpe dịrị ọgbakọ Izrel, na ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.