43Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
44Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
45Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
46“ ‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
47Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’ ”