8Onye nchụaja ga-eleru ya anya, ọ bụrụ na onye nchụaja achọpụta na ọnya ahụ na-agbasa, ọ ga-agụ onye ahụ dịka onye rụrụ arụ, ọ bụ ọrịa na-efe efe.
9“Mgbe ọbụla mmadụ nwere ihe dị ka ọrịa na-efe efe nʼahụ ya, a ghaghị ịkpọtara ya onye nchụaja.
10Onye nchụaja ga-ele anya nʼakụkụ anụ ahụ ya zara aza ịchọpụta ma ọ dị ọcha, ma ajị dị gburugburu ebe ahụ ọ na-acha ọcha, na ịhụkwa ma ọ nwere ọnya dị gburugburu ebe ahụ.
11Ọ bụrụ na onye nchụaja ahụ ihe ndị a, ọ bụ ọrịa ekpenta nʼezie. Ọ ga-agụkwa onye ahụ dịka onye rụrụ arụ. A gaghị edebekwa ya ile ya ahụ, nʼihi na ọ bụrụlarị onye rụrụ arụ.
12“Ọ bụrụ na onye nchụaja elee onye ahụ anya hụ na ọrịa ọcha ahụ enupụtala nʼakụkụ ahụ ya niile, site nʼụkwụ ya ruo nʼisi ya,