45Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
46“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
47Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
48“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.