47Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
48“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
50Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
51Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.