48“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
49Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
50Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
51Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
52Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.