Levitikọs 16

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu Onyenwe anyị nwụsịrị.

Leviticus 16:1 (UKJV) And the LORD spoke unto Moses after the death of the two sons of Aaron, when they offered before the LORD, and died;

1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu Onyenwe anyị nwụsịrị.

2Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ.

3“Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.