2Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime Ebe ahụ Kachasị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ.
3“Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,
4Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha, ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha.
5Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ.
6“Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya.