15“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.
16“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke.
17“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
18“ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
19“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.