17“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
18“ ‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
19“ ‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
20“ ‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
21“ ‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.