2“Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
3Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.
4Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
5Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
6“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.