4Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
5Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
6“ ‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
7“ ‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.
8“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.