11Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
12Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
13Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
14“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
15Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,