Levitikọs 22

Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,

Leviticus 22:15 (UKJV) And they shall not profane the holy things of the children of Israel, which they offer unto the LORD;

13Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.

14“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.

15Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,

16site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’ ”

17Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.